Ihe Gbasara Ọnwụ na Akwamozu N’etiti Ndị Igbo Tụmadị Amagunze Dị N’ọwụwa Anyanwu Nkanụ na Steeti Enugu nke Naịjirịa
Main Article Content
Abstract
Ọnwụ bụ ihe a na-ahụ dịka oku dị oke mkpa nke mmadụ ọbụla ga-azarịrị. N’ihi ya, ihe niile nwere ndụ ga-anwụ anwụ ma ree ure. Akwamozu nke pụtara ili onye nwụrụ anwụ ka a na-ahụ dịka ịkwanyere onye nwụrụ anwụ ugwu. N’ihi ya, ihe ọmụmụ a bu n’uche ileba anya na nkọwa ihe bụ ọnwụ na etu e si eme akwamozu n’ala Igbo nke ga-ehibe isi n’obodo Amagunze di n’ọnụwa anyanwụ Nkanụ na Steeti Enugu, Naịjirịa. E nwetara data maka ihe ọmụmụ a site n’ajụjụ a gbara ndị mmadụ nakwa usoro nleta nsonye. Ihe ọmụmụ a gbasoro usoro nchọcha sọvee nkọwa. Site na nchọpụta e mere, ndị nchọcha chọpụtara na obodo Amagunze nwere emume akwamozu ụfọdụ a ga-emerịrị; tupu elie onye nwụrụ anwụ ma ka e lichara onye nwụrụ anwụ dịka usoro emume. Ihe ọmụmụ a kpakwara nkata banyere etu mmepe obodo na ọlọrọhụrụ si emetụta ọnọdụ akwamozu n’obodo Amagunze nke nwere uru na ọghọm ọ na-emetụta n’ala Igbo niile.