NLEBAANYA NA NKWUHIE DỊ NA MKPARỊTA ỤKA NDỊ ỌCHỊCHỊ NAỊJIRỊA AHỌỌRỌ

Main Article Content

Chioma M. Akaeze
Ndubuisi Ogbonna AHAMEFULA
Eunice Chinwendu Ndubuisi

Abstract

Nchọcha a lebara anya na nkwujọ na nkwuhịe ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọchịchị na ndị ọrụ gọmenti Naijirịa n’okwu ọha. Mbunuche nchọcha a bụ inyocha okwu dị iche iche nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke ndị ọrụ gọọmenti n’ọha. Ndị nchọcha jiri atụtụ nkwuhịe ọnụ nke Freud ma ọ bụ atụtụ paraprazis ma gbasoro usoro nkọwa kwọlitetiv nyọchaa nchọcha a. Nchọcha a nyọchara okwu iri na atọ nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọrụ gọmentị na Naijirịa. Nchọpụta e nwetara na nchọcha a gosiri na nkwujọ na nkwuhie na-esite n’ime ahụ ma na-adapụta mmadụ na-amaghị ama. Ndị nchọcha chọpụtara na nkwujọ na nkwuhie okwu na-adapụta mgbe mmadụ bu ihe ọzọ n’obi ma hụ onwe ya ikwupụta ihe ọzọ bụkwa nke a hụtara n’ebe ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọrụ gọmentị nọ n’obodo Naijịrịa. Nchọcha a na-atụzi aka ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọrụ gọmentị bụrụ ndị ga-agbalị imata iwu dị n’ụtọ asụsụ nke asụsụ ha chọrọ iji mepụta okwu ma nwee mkpachapụ anya mgbe ọ bụla ha na-emepụta okwu n’ọha iji gbanahụ ma gbochie nkwujọ na nkwuhie.

Article Details

How to Cite
Akaeze, C. M., AHAMEFULA, N. O., & Ndubuisi, E. C. (2025). NLEBAANYA NA NKWUHIE DỊ NA MKPARỊTA ỤKA NDỊ ỌCHỊCHỊ NAỊJIRỊA AHỌỌRỌ. EBSU Journal of Social Sciences and Humanities, 15(1). Retrieved from https://www.ebsu-jssh.com/index.php/EBSUJSSH/article/view/282
Section
Articles